1O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu.
3Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya kunyekwanụ mmiri nʼime ya.
4Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.