19Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”
20Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
21Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.
22Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri.
23Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.