5Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.
6“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.
7“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.
8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.
9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.