18Ugbu a, lee na ala niile dị nʼọnụ mmiri nke osimiri na-ama jijiji nʼihi ọdịda gị. Ọ bụladị agwa etiti niile ka ụjọ juru obi nʼihi nkwatu a kwatụrụ gị.’
19“Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị,
20mgbe ahụ ka m ga-eme ka ị rịdaruo nʼala mmụọ, gị na ndị na-arịda nʼolulu, ka i jekwuru ndị mgbe ochie. Aga m eme ka ebe obibi gị bụrụ nʼokpuru ime ime ala, ka ị dịrị ka obodo ndị ochie ahụ e tikpọrọ etikpọ. Gị na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ị gaghị esitekwa nʼebe ahụ lọghachi ịbịa isoro ndị dị ndụ birikwa.
21Aga m eme ka ọgwụgwụ gị bụrụ ihe a ga-atụ egwu. Ị gaghị adịkwa. A ga-achọ gị, ma agaghị achọta gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”