Izikiel 27

na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

Ezekiel 27:19 (UKJV) Dan also and Javan going back and forth occupied in your fairs: bright iron, cassia, and calamus, were in your market.

17“ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

18“ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,

19na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

20“ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.

21“ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.