Izikiel 27

“ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,

Ezekiel 27:18 (UKJV) Damascus was your merchant in the multitude of the wares of your making, for the multitude of all riches; in the wine of Helbon, and white wool.

16“ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

17“ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

18“ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,

19na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

20“ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.