7ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị, bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị, ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.
8Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ. Ị ga-anwụ ọnwụ ike nʼetiti oke osimiri niile.
9Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.
10Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu, site nʼaka ndị ọbịa. Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,