8“ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị.
9Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.”
10Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.
11Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.
12Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.