Izikiel 29

Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’ ”

Ezekiel 29:16 (UKJV) And it shall be no more the confidence of the house of Israel, which brings their iniquity to remembrance, when they shall look after them: but they shall know that I am the Lord GOD.

14Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ.

15Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ.

16Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’ ”

17Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

18“Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.