1Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.”
2Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie.
3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.