10Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị.
11Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.”
12Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke Onyenwe anyị sị nʼọnọdụ ya bilie.
13Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha.
14Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.