7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu, nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu. Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe, nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.
8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.
9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.
10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
11Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere, ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt, werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.