9Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
10“ ‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,
11Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.
12Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.
13Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri.