29“Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu.
30“Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu.
31“Fero na ndị agha ya niile ga-ahụ ndị a, ọ ga-enwe nkasiobi maka ndị ya niile, na usuu ndị agha ya niile ndị eji mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
32Nʼagbanyeghị na emeela m ka ọ gbasaa ụjọ nʼala ndị dị ndụ, Fero na igwe mmadụ a niile ka a ga-eli nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, ya na ndị ejiri mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”