Izikiel 34

“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha.

Ezekiel 34:11 (UKJV) For thus says the Lord GOD; Behold, I, even I, will both search my sheep, and seek them out.

9nʼihi ya, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:

10Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ana m edo onwe m megide ndị ọzụzụ atụrụ niile. Ọ bụkwa nʼaka ha ka m ga-ajụta ihe banyere igwe ewu na atụrụ m. Aga m eme ka ha kwụsị ị bụ ndị na-azụ igwe ewu na atụrụ m, ka ndị ọzụzụ atụrụ ndị a ghara ịzụ onwe ha nri ọzọ. Aga m esite nʼọnụ ha napụta igwe ewu na atụrụ m, ha agaghị abụkwara ha nri ọzọ.

11“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha.

12Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ.

13Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.