15Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile. Aga m eme ka ha makpuru nʼudo, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
16Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha.
17“ ‘Ma unu onwe unu, ụmụ igwe anụ ụlọ m, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m ekpe ikpe nʼetiti atụrụ na atụrụ, ebule na mkpi.
18Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-ata nri kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ zọtọsịa nke fọdụrụ? Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-aṅụ mmiri nke kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ unu na-agbarụ nke fọdụrụ?
19Ọ bụ ihe kwesiri ekwesi na igwe atụrụ m ga-ata nri unu zọtọrọ azọtọ, ma ṅụọkwa mmiri unu gbarụrụ agbarụ?