13Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma.
14Aga m azụ ha nʼebe ịta ahịhịa mara mma, na nʼelu ugwu niile nke Izrel. Nʼebe ahụ ka ha ga-amakpukwa nʼudo. Ha ga-ata nri nʼebe ịta ahịhịa mara mma nke elu ugwu Izrel.
15Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile. Aga m eme ka ha makpuru nʼudo, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
16Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha.
17“ ‘Ma unu onwe unu, ụmụ igwe anụ ụlọ m, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m ekpe ikpe nʼetiti atụrụ na atụrụ, ebule na mkpi.