21Nʼihi na unu ji akụkụ ahụ unu, na ubu aka unu na-enupu ha. Unu jikwa mpi unu na-enupu ndị na-adịghị ike, tutu ruo mgbe unu chụsachara ha.
22Lee, aga m azọpụta igwe ewu na atụrụ m. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. Ha agaghị aghọkwa ihe oriri ọzọ. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya.
23Aga m edobe otu onye ọzụzụ atụrụ nke ga-elekọta ndị m, ọ bụladị ohu m Devid. Ya onwe ya ga-elekọta ha, bụrụkwa onye ọzụzụ atụrụ nye ha.
24Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-abụ Chineke ha, ma ohu m Devid ga-abụ onyeisi nʼetiti ndị m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
25“ ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu.