4Unu anaghị eme ka ndị na-adịghị ike dị ike, maọbụ gwọọ ndị na-arịa ọrịa, maọbụ kechie ọnya ndị merụrụ ahụ. Unu adịghị akpọghachite ndị kpafuru akpafu, maọbụ pụọ ịchọ ndị furu efu. Kama naanị aka ike ka unu ji na-achị ha.
5Nʼihi ya, ha agbasasịala nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ anọghị ya. Ha aghọkwaarala anụ ọhịa niile ihe oriri.
6Igwe ewu na atụrụ nke m na-awagharị nʼugwu niile, na nʼelu ugwu nta niile. Ọ bụkwa nʼelu ụwa niile ka ha gbasara. Ọ dịkwaghị onye na-ajụ ajụjụ banyere ha. Ọ dịkwaghị onye na-elenye anya nʼebe ha nọ.
7“ ‘Nʼihi nke a, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:
8Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe unu hapụrụ igwe atụrụ m na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, mee ka ha ghọọrọ anụ ọhịa ihe oriri, ebe unu na-achọgharịghị ha, kama unu nọ na-enyeju onwe unu afọ, ma hapụ igwe atụrụ m ka agụụ gbuo ha,