1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, chee ihu imegide nʼugwu Sia, buo amụma megide ya,
3sị ya, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Mụ onwe m na-emegide gị, gị ugwu Sia. Aga m esetikwa aka m imegide gị, mee gị ka ị ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.
4Obodo gị niile ka m ga-eme ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, gị onwe gị ga-abụkwa ebe tọgbọrọ nʼefu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
5“ ‘Nʼihi na i sitere nʼiro ahụ dị gị nʼobi siterịị na mgbe ochie rara ụmụ Izrel nye nʼaka mma agha, nʼoge ha nọ na-ahụju anya, nʼoge ahụ ịta ahụhụ nke ajọ omume ruru nʼogo dị ukwuu.