8“ ‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya.
9Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu.
10Aga m emekwa ka ọnụọgụgụ ndị ga-ebi nʼime unu baa ụba, ọ bụladị ụlọ Izrel niile. Ha ga-ebikwa nʼobodo niile, wugharịakwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ.
11Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
12Aga m eme ka ndị m, ndị m bụ Izrel, biri nʼime unu. Unu ga-abụ ihe nweta ha, unu ga-aghọkwara ha ihe nketa. Unu agakwaghị agbaba ha aka ụmụ ọzọ.