Izikiel 36

Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu.

Ezekiel 36:9 (UKJV) For, behold, I am for you, and I will turn unto you, and all of you shall be tilled and sown:

7Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, eweliri m aka m elu ṅụọ iyi na mba ndị a gbara unu gburugburu ga-anọkwa nʼọnọdụ ihere.

8“ ‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya.

9Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu.

10Aga m emekwa ka ọnụọgụgụ ndị ga-ebi nʼime unu baa ụba, ọ bụladị ụlọ Izrel niile. Ha ga-ebikwa nʼobodo niile, wugharịakwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ.

11Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.