Izikiel 36

Agaghị m emekwa ka ị nụrụ mkparị nke ndị mba ọzọ na-akparị gị. Ị gaghị anọkwa ọnọdụ nke ga-eme ka ndị mba ọzọ lelịa gị, maọbụ nọọ ọnọdụ nke ga-eme ka ị sọọ ngọngọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Ezekiel 36:15 (UKJV) Neither will I cause men to hear in you the shame of the heathen any more, neither shall you bear the reproach of the people any more, neither shall you cause your nations to fall any more, says the Lord GOD.

13“ ‘Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼihi na ụfọdụ mba na-ekwutọ gị na-asị, “Ị bụ ala na-eri ụmụ ya, ala na-agbaba ndị ya aka ụmụ.”

14Nʼihi nke a, ị gaghị erikwa mmadụ ọzọ. Ị gaghị agbawakwa mba gị aka ụmụ ọzọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

15Agaghị m emekwa ka ị nụrụ mkparị nke ndị mba ọzọ na-akparị gị. Ị gaghị anọkwa ọnọdụ nke ga-eme ka ndị mba ọzọ lelịa gị, maọbụ nọọ ọnọdụ nke ga-eme ka ị sọọ ngọngọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

16Ọzọkwa, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,

17“Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.