Izikiel 36

“Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile.

Ezekiel 36:17 (UKJV) Son of man, when the house of Israel dwelt in their own land, they defiled it by their own way and by their doings: their way was before me as the uncleanness of a removed woman.

15Agaghị m emekwa ka ị nụrụ mkparị nke ndị mba ọzọ na-akparị gị. Ị gaghị anọkwa ọnọdụ nke ga-eme ka ndị mba ọzọ lelịa gị, maọbụ nọọ ọnọdụ nke ga-eme ka ị sọọ ngọngọ. Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

16Ọzọkwa, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,

17“Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile.

18Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m, nʼihi na ha na-awụsi ọbara nʼala ahụ, jirikwa arụsị ha na-emerụ ya.

19Achụsasịrị m ha na mba dị iche iche. Otu a ka m si kpee ha ikpe nʼihi ụzọ ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.