17“Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile.
18Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m, nʼihi na ha na-awụsi ọbara nʼala ahụ, jirikwa arụsị ha na-emerụ ya.
19Achụsasịrị m ha na mba dị iche iche. Otu a ka m si kpee ha ikpe nʼihi ụzọ ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha.
20Ma ebe niile ha gara nʼetiti mba niile, ha mere ka aha nsọ m gharakwa ịdị nsọ, nʼihi na a na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị nke Onyenwe anyị, ma agbanyeghị nke a, ha sitere nʼala ya pụọ.’
21Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara.