1Aka nke Onyenwe anyị dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ.
2O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ.
3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?” Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ naanị gị onwe gị maara.”