36Mgbe ahụ, mba niile gbara unu gburugburu, bụ ndị fọdụrụ, ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị wuziri ebe niile e tikpọrọ etikpọ, kụọkwa mkpụrụ nʼebe niile tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola, aga m emekwa ya.’
37“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọzọkwa, aga m ege ntị, zaa ekpere ụlọ Izrel, mezuoro ha arịrịọ ha. Aga m eme ka ha baa ụba dịka igwe anụ ụlọ,
38dịka igwe anụ ụlọ, nke na-ejupụta na Jerusalem nʼoge mmemme ya niile a kara aka. Nʼụzọ dị otu a, obodo niile e tikpọrọ etikpọ ga-ejupụtakwa na mmadụ ọzọ. Mgbe ahụ ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”