Izikiel 37

Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Ezekiel 37:13 (UKJV) And all of you shall know that I am the LORD, when I have opened your graves, O my people, and brought you up out of your graves,

11Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’

12Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel.

13Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

14Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.