Izikiel 37

Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Ezekiel 37:15 (UKJV) The word of the LORD came again unto me, saying,

13Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

14Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

16“Nwa nke mmadụ, were osisi dee ihe ndị a nʼelu ya, ‘Osisi a nọchiri anya Juda na ndị Izrel e kekọtara ya na ha ọnụ.’ Werekwa osisi ọzọ deekwa okwu ndị a nʼelu ya. ‘Osisi a nọchiri anya Ifrem, na Josef, na ndị Izrel niile e jikọtara ha na ndị a ọnụ.’

17Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.