14Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
16“Nwa nke mmadụ, were osisi dee ihe ndị a nʼelu ya, ‘Osisi a nọchiri anya Juda na ndị Izrel e kekọtara ya na ha ọnụ.’ Werekwa osisi ọzọ deekwa okwu ndị a nʼelu ya. ‘Osisi a nọchiri anya Ifrem, na Josef, na ndị Izrel niile e jikọtara ha na ndị a ọnụ.’
17Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị.
18“Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’