Izikiel 37

gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’

Ezekiel 37:19 (UKJV) Say unto them, Thus says the Lord GOD; Behold, I will take the stick of Joseph, which is in the hand of Ephraim, and the tribes of Israel his fellows, and will put them with him, even with the stick of Judah, and make them one stick, and they shall be one in mine hand.

17Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị.

18“Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’

19gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’

20Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha,

21ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.