22Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ.
23Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
24“ ‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile.
25Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi.
26Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.