20Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha,
21ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha.
22Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ.
23Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
24“ ‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile.