4Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke Onyenwe anyị.
5Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ.
6Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
7Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ.
8Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha.