21Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
22Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ.
23Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’