Izikiel 38

Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ.

Ezekiel 38:22 (UKJV) And I will plead against him with pestilence and with blood; and I will rain upon him, and upon his bands, and upon the many people that are with him, an overflowing rain, and great hailstones, fire, and brimstone.

20Azụ niile dị nʼoke osimiri, na anụ ufe nke eluigwe, na anụ ọhịa, na ihe niile na-akpụ akpụ, na mmadụ niile nọ nʼelu ụwa ga-ama jijiji nʼihu m. A ga-akwatu ugwu niile, ebe niile dị mkputamkpu ga-adarukwa ala.

21Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

22Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ.

23Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.