1“Ma gị, nwa nke mmadụ buo amụma megide Gog, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m emegide gị, Gog, onyeisi nke Meshek na Tubal.
2Aga m echigharị gị, kpụrụ gị na-aga. Aga m esi nʼebe dịkarịsịrị anya nʼakụkụ ugwu kpọta gị, ziga gị ka i buso ugwu niile nke Izrel agha.
3Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ.
4Nʼelu ugwu niile nke Izrel ka ị ga-ada, gị onwe gị, na usuu ndị agha gị niile, na mba niile dị iche iche ndị na-eso gị. Udele niile dị iche iche na anụ ọhịa niile ka m ga-enyefe anụ ahụ unu ka ha were unu mere ihe oriri.