Izikiel 39

Agaghị m ezokwa ihu m ọzọ nʼebe ha nọ, nʼihi na aga m awụkwasị ụlọ Izrel Mmụọ m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”

Ezekiel 39:29 (UKJV) Neither will I hide my face any more from them: for I have poured out my spirit upon the house of Israel, says the Lord GOD.

27Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche.

28Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Ha ga-amata na ọ bụ ezie na ọ bụ m mere ka a dọta ha nʼagha buru ha jee mba dị iche iche, na m ga-achịkọta ha mee ka ha lọghachi nʼala nke aka ha. Ọ dịkwaghị onye a ga-ahapụ na mba ọzọ.

29Agaghị m ezokwa ihu m ọzọ nʼebe ha nọ, nʼihi na aga m awụkwasị ụlọ Izrel Mmụọ m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.