1Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ.
2Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ.
3O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya.