Izikiel 40

O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya.

Ezekiel 40:3 (UKJV) And he brought me thither, and, behold, there was a man, whose appearance was like the appearance of brass, with a line of flax in his hand, and a measuring reed; and he stood in the gate.

1Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ.

2Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ.

3O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya.

4Nwoke ahụ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, lezie anya nke ọma, gekwaa ntị tinyekwa ihe niile m gaje igosi gị nʼobi, nʼihi na-akpọtara m gị nʼebe a nʼihi ka ịhụ ihe ndị a. Gwakwa ụmụ Izrel ihe niile ị hụrụ.”

5Mgbe ahụ, ahụrụ m mgbidi gbara ụlọnsọ ahụ gburugburu. Ịdị ogologo nke osisi ihe ọtụtụ nke dị nʼaka nwoke ahụ, ruru mita atọ na ụma abụọ, nke ọbụla nʼime ha ruru iri sentimita ise na atọ. Ọ tụrụ mgbidi ahụ, chọpụta na ịla elu ya dị mita atọ na ọkara. Ịsa mbara ya dịkwa mita atọ na ọkara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.