3Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ.
4Nʼelu ugwu niile nke Izrel ka ị ga-ada, gị onwe gị, na usuu ndị agha gị niile, na mba niile dị iche iche ndị na-eso gị. Udele niile dị iche iche na anụ ọhịa niile ka m ga-enyefe anụ ahụ unu ka ha were unu mere ihe oriri.
5Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
6Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
7“ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ. Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel.