5Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
6Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
7“ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ. Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel.
8Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya.
9“ ‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ.