Izikiel 4

“Ugbu a, gị nwa nke mmadụ, were otu ọkpụrụkpụ aja, tọgbọ ya nʼihu gị. Sepụtakwa obodo Jerusalem nʼelu ya.

Ezekiel 4:1 (UKJV) You also, son of man, take you a tile, and lay it before you, and illustrate upon it the city, even Jerusalem:

1“Ugbu a, gị nwa nke mmadụ, were otu ọkpụrụkpụ aja, tọgbọ ya nʼihu gị. Sepụtakwa obodo Jerusalem nʼelu ya.

2Seekwa ihe nnọchigide nʼagha megide ya, wuokwa ụlọ ndị agha gburugburu ya, wukọta ụlọ ikwu dị iche iche megide ya na ihe e ji akụdasị mgbidi ya niile.

3Werekwa efere igwe debe nʼetiti gị na obodo ahụ dịka mgbidi e ji igwe wuo. Chee obodo ahụ ihu gị, ka ị chegide ya nke ọma nʼihi na ndị iro gbara ya gburugburu. Nke a ga-abụ ihe ama nye ndị Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.