Izikiel 4

A ga-atụ ihe oriri gị atụ, nri nke ị ga-eri otu mgbe ga-abụ narị gram abụọ na iri gram atọ; naanị otu mgbe ka ị ga-eri nri nʼụbọchị.

Ezekiel 4:10 (UKJV) And your food which you shall eat shall be by weight, twenty shekels a day: from time to time shall you eat it.

8Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo.

9“Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri.

10A ga-atụ ihe oriri gị atụ, nri nke ị ga-eri otu mgbe ga-abụ narị gram abụọ na iri gram atọ; naanị otu mgbe ka ị ga-eri nri nʼụbọchị.

11A ga-ekupụtakwa mmiri ị ga-aṅụ, ị ga-aṅụ mmiri naanị otu ugboro nʼụbọchị, otu udu mmiri e kere ụzọ isii.

12Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.