4“Ugbu a, dinara ala nʼakụkụ aka ekpe gị, aga m enye gị ntaramahụhụ mmehie ndị Izrel, ị ga-ata ahụhụ mmehie ha ụbọchị niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị.
5Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel.
6“Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-edina ala nke ugboro abụọ, ma ọ ga-abụ nʼakụkụ aka nri gị, ị ga-eburu ntaramahụhụ mmehie ndị Juda. Ọ bụ iri abalị anọ, otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ.
7Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya.
8Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo.