16Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha.
17Ọ kpọbatara m nʼogige dị nʼezi. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ọnụụlọ dị na pevumentị e wunyere gburugburu ogige ahụ niile. Ha dị iri ọnụụlọ atọ dị nʼogologo pevumentị ahụ.
18Ebe nzọkwasị ụkwụ a gara ogologo ruo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, ogologo ya na ọnụ ụzọ ama ahụ ha, nke a bụ pevumentị nke dịkarịrị ala.
19Mgbe ahụ, ọ tụrụ ịdị ogologo ya, site nʼime ọnụ ụzọ ama nke dịkarịrị ala ruo nʼọnụ ụzọ nke ime ogige, o ruru iri mita ise na atọ nʼakụkụ ihu anyanwụ nakwa nʼakụkụ ugwu.
20Ọ tụrụ ogologo na obosara ọnụ ụzọ nke dị nʼugwu, nke e si abanye nʼogige dị nʼezi.