Izikiel 40

Mgbe ahụ, ọ tụrụ ịdị ogologo ya, site nʼime ọnụ ụzọ ama nke dịkarịrị ala ruo nʼọnụ ụzọ nke ime ogige, o ruru iri mita ise na atọ nʼakụkụ ihu anyanwụ nakwa nʼakụkụ ugwu.

Ezekiel 40:19 (UKJV) Then he measured the breadth from the forefront of the lower gate unto the forefront of the inner court without, an hundred cubits eastward and northward.

17Ọ kpọbatara m nʼogige dị nʼezi. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ọnụụlọ dị na pevumentị e wunyere gburugburu ogige ahụ niile. Ha dị iri ọnụụlọ atọ dị nʼogologo pevumentị ahụ.

18Ebe nzọkwasị ụkwụ a gara ogologo ruo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, ogologo ya na ọnụ ụzọ ama ahụ ha, nke a bụ pevumentị nke dịkarịrị ala.

19Mgbe ahụ, ọ tụrụ ịdị ogologo ya, site nʼime ọnụ ụzọ ama nke dịkarịrị ala ruo nʼọnụ ụzọ nke ime ogige, o ruru iri mita ise na atọ nʼakụkụ ihu anyanwụ nakwa nʼakụkụ ugwu.

20Ọ tụrụ ogologo na obosara ọnụ ụzọ nke dị nʼugwu, nke e si abanye nʼogige dị nʼezi.

21Ime ụlọ ya dị ọnụ ụlọ atọ nʼakụkụ ya ọbụla. Akụkụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ya, bụ otu ọtụtụ dịka ọtụtụ nke ọnụ ụzọ ama mbụ. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.