Izikiel 40

Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

Ezekiel 40:29 (UKJV) And the little chambers thereof, and the posts thereof, and the arches thereof, according to these measures: and there were windows in it and in the arches thereof round about: it was fifty cubits long, and five and twenty cubits broad.

27Ogige nke dị nʼime, nwekwara ọnụ ụzọ ama nke na-echere ihu na ndịda. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.

28O duuru m site nʼọnụ ụzọ dị na ndịda banye nʼogige dị nʼime. Ọ tụrụ ọnụ ụzọ mbata a hụ na ya na ọnụ ụzọ nke dị ọzọ bụ otu ọtụtụ.

29Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

30Mpụta ọnụ ụlọ nke ndị dị gburugburu ogige nke ime, dị iri mita na atọ nʼobosara, na mita abụọ na ụma atọ nʼịdị omimi.

31Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.