Izikiel 40

Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.

Ezekiel 40:31 (UKJV) And the arches thereof were toward the utter court; and palm trees were upon the posts thereof: and the going up to it had eight steps.

29Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

30Mpụta ọnụ ụlọ nke ndị dị gburugburu ogige nke ime, dị iri mita na atọ nʼobosara, na mita abụọ na ụma atọ nʼịdị omimi.

31Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.

32Ọ kpọbatakwara m nʼogige dị nʼime site nʼọnụ ụzọ mbata nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụkwara ọnụ ụzọ ama ahụ, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụkwa otu ọtụtụ.

33Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya niile bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.