40Nʼakụkụ mgbidi ezi nke mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, nʼakụkụ ihe nrigo nke dị na mbata ọnụ ụzọ ugwu, e nwere tebul abụọ, nʼakụkụ nke ọzọkwa nke ihe nrigo ahụ, e nwekwara tebul abụọ nʼebe ahụ.
41Ya mere, e nwere tebul anọ nʼotu akụkụ ihe nrigo ahụ, nwekwa anọ nʼakụkụ nke ọzọ ya, ya bụ, tebul asatọ ma agụkọta ya ọnụ, ebe a na-anọ egbu anụ e ji achụ aja.
42E nwekwara tebul anọ ndị ọzọ nʼime ọnụ ụlọ ahụ e ji nkume a wara awa wuo. Nʼelu ya ka a na-anọ akwado anụ a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ. Ịdị elu tebul ndị a bụ iri sentimita asatọ. Obosara elu ha nʼakụkụ niile dị iri sentimita ise na atọ. Ngwongwo niile e ji egbu anụ e ji achụ aja na-adị nʼelu tebul ndị a.
43E ji nko nke ịdị ogologo ya dị sentimita itoolu ejigidesi tebul ndị ahụ ike nʼahụ aja ụlọ. Nko ndị a dị gburugburu tebul ndị ahụ. Ọ bụkwa nʼelu tebul ndị a ka a na-edebe anụ niile e ji enye onyinye.
44Nʼime ogige dị nʼime, e nwere ọnụụlọ abụọ nke nwere ụzọ e si abanye nʼogige dị nʼime. Otu dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, chee ihu nʼọdịda anyanwụ, nke ọzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dị nʼọdịda anyanwụ, chee ihu nʼugwu.